📖 ABSTRACT/OVERVIEW
Mkpụrụokwu nzuzo ma ọ bụ slang na-aga n'ihu na-eto eto n'etiti ụmụ akwụkwọ mahadum dị ka ụzọ ha si egosipụta njirimara ọgbọ ha na ịnwe nzuzo na mkparịta ụka ha, ma ọtụtụ n'ime mkpụrụokwu ndị a a na-ejikwa Igbo eme ka ọ baa ụba n'ụzọ ọhụrụ. Nyocha a bụ inyocha mkpụrụokwu nzuzo ụmụ akwụkwọ mahadum dị na mpaghara Nsụka na-eji mgbe ha na-asụ Igbo, ịchọpụta usoro e si eji asụsụ ahụ emepụta ha. E ji usoro nyocha sociolinguistics rụọ ọrụ, ebe e dekọtara mkpụrụokwu site na mkparịta ụka ụmụ akwụkwọ narị abụọ n'ime ogige mahadum n'ime ọnwa isii. Nsonaazụ gosiri na ụmụ akwụkwọ na-emepụta mkpụrụokwu nzuzo site n'ụzọ dị iche iche, gụnyere ịgbanwe nghọta okwu Igbo ochie inye ya nghọta ọhụrụ, ịgwakọta Igbo na bekee n'otu okwu, na ịkpụzi okwu ọhụrụ kpamkpam. Achọpụtakwara na mkpụrụokwu ndị a na-agbanwe ngwa ngwa site n'otu ọmụmụ ihe ruo n'ọzọ, na-eme ka ọ siri ike ịchịkọta ha n'ọkọwa okwu. Ihe ndị na-akpata mmepe mkpụrụokwu ndị a metụtara mmasị ime ka mkparịta ụka ha bụrụ ihe naanị ndị otu ha ga-aghọta, na-egbochi ndị okenye ịghọta ha. N'ikpeazụ, nyocha a kwuru na mkpụrụokwu nzuzo, n'agbanyeghị na ọ na-adị mgbe ụfọdụ iche na Igbo ọkọlọtọ, na-egosi na asụsụ Igbo ka dị ndụ na ike n'etiti ọgbọ ọhụrụ, ọ bụghị na ọ na-anwụ anwụ dịka ụfọdụ chere.
Keywords: mkpụrụokwu nzuzo, ụmụ akwụkwọ mahadum, sociolinguistics, asụsụ Igbo, ọgbọ ọhụrụ
Need Complete Chapters of the Above Topic?
Get high-quality, Zero-AI research materials with current citations.
Request via WhatsApp 💬